Deuteronomi 3 IGBOB

1 Ayi we che iru, rigo n'uzọ Beshan: Og, bú eze Beshan, we puta izute ayi, ya onwe-ya na ndi-ya nile, ibu agha, rue Edrei.

2 Jehova we sim, Atula egwu ya: n'ihi na n'aka-gi ka M'nyeworo ya, na ndi-ya nile, na ala-ya; i gēme kwa ya dika i mere Saihon, bú eze ndi-Amorait, onye bi na Heshbon.

3 Jehova, bú Chineke-ayi, we nye kwa n'aka-ayi Og, bú eze Beshan, na ndi-ya nile: ayi we tib͕ue ya rue mb͕e ọ nādighi otù onye fọduru arapuru ya.

4 Ayi we were obodo-ya nile na mb͕e ahu; ọ dighi obodo ayi nānaraghi n'aka-ha; ọgu obodo atọ, akuku Agob nile, bú ala-eze Og nime Beshan.

5 Ndia nile bu obodo eji mb͕idi di elu, na ọnu-uzọ-ama, na nkpọrọ, wusi ike; nāgughi obodo nēnweghi mb͕idi, ha bara uba nke-uku.

6 Ayi we wezuga ha ka ebibie ha, dika ayi mere Saihon, bú eze Heshbon, nēwezuga obodo, ndikom ọ bula, ya na ndinyom, na umu-ntakiri, ka ebibie ya.

7 Ma anu-ulo nile, na ihe-nkwata nke obodo ahu nile, ayi lutara ha n'agha n'onwe-ayi.

8 Na mb͕e ahu ka ayi nara ala ahu n'aka eze abua nke ndi-Amorait ndi bi n'ofè Jọdan, site na ndagwurugwu Anon rue ugwu Heamon:

9 (ndi Saidon nākpọ Heamon ahu Sirion, ma ndi-Amorait nākpọ ya Senia;)

10 bú obodo nile nke ala ahu di lari, na Gilead nile, na Beshan nile, rue Saleka na Edrei, bú obodo ala-eze Og nime Beshan.

11 (N'ihi na nání Og, bú eze Beshan, ka arapuru site na ndi fọduru nke Refaim; le, ihe-ndina-ya bu ihe-ndina ígwè; ihe-ndina ahu, ọ̀ dighi na Raba nke umu Amon? cubit iteghete ka ogologo-ya di, cubit anọ ka obosara-ya di kwa, dika cubit nke nwoke si di.)

12 Ala nka ka ayi nweta-kwa-ra mb͕e ahu: site n'Aroea, nke di n'akuku ndagwurugwu Anon, na nkera ugwu Gilead, na obodo nile ya, ka m'nyere ndi Reuben nye kwa ndi Gad:

13 nke fọduru nime Gilead, na Beshan nile, bú ala-eze Og, ka m'nyere nkera ebo Manase; akuku Agob nile (Beshan ahu nile ka anākpọ ala Refaim.

14 Jaia nwa Manase were akuku Agob nile, rue ókè-ala ndi Geshua na ndi Meakat; ọ we kpọ ha Beshan-havot-jaia, n'aha-ya, rue ta.)

15 Ọ bu kwa Makia ka m'nyere Gilead.

16 M'we nye ndi Reuben nye kwa ndi Gad site na Gilead we rue ndagwurugwu Anon, bú etiti ndagwurugwu ahu, ka ọ buru ókè-ala; we rue miri-iyi Jabok, bú ókè-ala umu Amon;

17 na Araba, na Jọdan, ka ọ buru ókè-ala, site na Kineret we rue oké osimiri Araba, bú Oké Osimiri Nnú, n'okpuru nkpọrube Pisga, n'akuku ọwuwa-anyanwu.

18 M'we nye unu iwu na mb͕e ahu, si, Jehova, bú Chineke-unu, enyewo unu ala nka inweta ya: na njikere-agha ka unu gāgabiga n'iru umu-nne-unu, bú umu Israel, unu ndi-dìnkpà nile.

19 Ọ bu nání na ndinyom-unu, na umu-ntakiri-unu, na anu-ulo-unu, (amawom na unu nwere ọtutu anu-ulo,) gānọdu n'obodo-unu nke m'nyeworo unu;

20 rue mb͕e Jehova gēme ka umu-nne-unu zuru ike, dika O mere unu, ha onwe-ha we nweta kwa ala ahu nke Jehova, bú Chineke-unu, nēnye ha n'ofè Jọdan: unu we laghachi, nwoke ọ bula rue ihe-nnweta-ya, nke m'nyeworo unu.

21 Joshua ka m'nye-kwa-ra iwu na mb͕e ahu, si, Anya-gi abua nāhu ihe nile Jehova, bú Chineke-unu, meworo eze abua ndia: otú a ka Jehova gēme ala-eze nile ebe gi onwe-gi nāgabiga.

22 Unu atula egwu ha: n'ihi na Jehova, bú Chineke-unu, Ya onwe-ya bu onye nēburu unu agha.

23 M'we riọ Jehova amara na mb͕e ahu, si,

24 Onye-nwe-ayi, Jehova, Gi onwe-gi amalitewo ime ka orù-Gi hu idi-uku-Gi, na aka-Gi di ike: n'ihi na òle chi di n'elu-igwe ma-ọbu n'uwa, nke nēme dika omume-Gi nile si di, na dika idi-ike-Gi nile si di?

25 Biko, ka m'gabiga, hu ezi ala ahu nke di n'ofè Jọdan, ezi ugwu ahu, na Lebanon.

26 Ma Jehova webigara iwe ókè n'arum n'ihi unu, O geghi-kwam nti: Jehova we sim, O zuwo gi; agwa-kwa-lam okwu bayere ihe a ọzọ ma-ọli.

27 Rigo n'elu Pisga, welie anya-gi abua le akuku Ọdida-anyanwu, na akuku Ugwu na akuku Ndida, na akuku ọwuwa-anyanwu, were kwa anya-gi abua le: n'ihi na i gaghi-agabiga Jọdan nka.

28 Nye kwa Joshua iwu, me kwa ya ka ọ di ike, b͕a kwa ya ume: n'ihi na ya onwe-ya gāgabiga n'iru ndi nka, ya onwe-ya gēme kwa ka ha keta ala ahu nke i nāhu.

29 Ayi we nọdu na ndagwurugwu na ncherita-iru Bet-peoa.

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31 32 33 34