Deuteronomi 32 IGBOB

1 Ṅanu nti, unu elu-igwe, ka m'kwu kwa ihe;Ka uwa nu kwa okwu ọnum:

2 Nmutam gātasi dika miri-ozuzo,Okwu-ọnum ganēruputa dika igirigi;Dika nshansha-miri n'elu ahihia ndu,Di kwa ka oké miri-ozuzo n'elu ihe-ọkukú:

3 N'ihi na aha Jehova ka m'gākpọsa:Nyenu Chineke-ayi idi-uku.

4 Oké nkume ahu, ihe zuru okè ka ọlu-Ya bu:N'ihi na uzọ-Ya nile bu ikpé ziri ezi:Chineke Nke kwesiri ntukwasi-obi, Nke nēnweghi ajọ omume,Onye ezi omume na onye ziri ezi ka Ọ bu.

5 Ha ebibiwo onwe-ha, ọ bughi nke umu-Ya ka ọlu nke di ha n'aru bu.Ha bu ọb͕ọ b͕agọrọ ab͕agọ nke rọ-kwa-ra arọ.

6 Ùnu nēnyeghachi Jehova otú a,Unu ndi-nzuzu ndi nāmaghi ihe?Ọ̀ bughi ya onwe-ya bu nna-gi onye nwetaworo gi?Ya onwe-ya emewo gi, me kwa ka i guzosie ike.

7 Cheta ubọchi nile nke mb͕e ebighi-ebi gara aga,Ghọta arọ nke ọtutu ọb͕ọ:Jua nna-gi, ọ gēgosi kwa gi;Jua ndi-okenye-gi, ha gāgwa kwa gi.

8 Mb͕e Onye kachasi ihe nile elu mere ka mba nile keta ihe-ha,Mb͕e O kesara umu madu,O guzoro ókè nile nke ndi nileDika ọnu-ọgugu umu Israel si di.

9 N'ihi na òkè Jehova bu ndi-Ya;Jekob bu akuku ihe-nketa-Ya.

10 Ọ chọtara ya n'ala ọzara,Na n'ihe tọb͕ọrọ nkití, bú ala tọb͕ọrọ n'efu nke nāb͕ọ uja.Ọ nāb͕a ya buruburu, Ọ nēme ka ọ ghọta ihe,Ọ nēchezi ya dika nwantanta anya-Ya:

11 Dika ugo nākpọte umu di n'akwu-ya,Nērughari n'elu umu-ya,Nāb͕asa nkù-ya, nāghọrọ ha,Nēbu ha n'elu nkù-ya:

12 Otú a Jehova, nání Ya, nēdu ya,Ọ dighi kwa chi ala ọzọ diyere ya.

13 Ọ nēme ka ebe di elu nke uwa būru ya dika inyinya,Ọ we rie ihe-ọmume nke ubi;O me-kwa-ra ya ka ọ mia manu-aṅu site na nkume di elu,Na manu site n'oké nkume ọ́mú;

14 Miri-ara nke raru araru nke ìgwè ehi, na miri-ara nke ìgwè ewu na aturu,Ya na abuba umu-aturu,Na ebulu àb͕ọ̀ Beshan, na ewu,Tiyere abuba obi ọka wheat;Ọbara nkpuru-vine ka i nāṅu kwa, bú manya-vine.

15 Jeshurun we ma abuba, we b͕a ukwu:I mawo abuba, i buwo ibù, abuba ekpuchiwo aru-gi:O we rapu Chineke nke mere ya,We kpọ Oké Nkume nke nzọputa-ya onye-nzuzu.

16 Ha nēwere ndi ala ọzọ me ka O kwo ekworo,Ha nēwere ihe-árú di iche iche kpasue Ya iwe.

17 Ha nāchuru ndi-mọ ọjọ aja, ndi nābughi Chineke,Bú chi ha nāmaghi,Ndi ọhu ndi si n'ebe di nso bata,Ndi nna-unu-hà nātughi ujọ.

18 Oké Nkume ahu nke muru gi ka i nēchefu,I chezọwo kwa Chineke nke muputara gi.

19 Jehova we hu ya, we lelia ha anya,N'ihi nkpasu-iwe nke umu-Ya ndikom na umu-Ya ndinyom.

20 O we si, Ka M'zopu irum n'ebe ha nọ,M'gāhu ihe gābu ikpe-azu-ha:N'ihi na ọb͕ọ nke nāb͕akuta azu ka ha bu,Umu ndi nēkwesighi okwukwe.

21 Ha onwe-ha ewerewo ihe nābughi Chineke mem ka M'kwo ekworo;Ha ewerewo ihe-efu nile ha kpasuem iwe:Mu onwem gēwere kwa ndi nābughi ndi me ha ka kwo ekworo;Mba nzuzu ka M'gēwere kpasue ha iwe.

22 N'ihi na amuyewo ọku n'iwem,Ọ nēre kwa rue ala-mọ nke dichasi ala,Ọ nēripia kwa uwa na ihe-ọmume-ya,Nēme kwa ka ntọ-ala nile nke ugwu nile nwuru ọku.

23 M'gēkpokwasi kwa ha ihe ọjọ;M'gāb͕apusi àkúm nile n'aru ha:

24 Ha gābu ndi tara aru n'agu, na ndi nruru-ọku rub͕uworo,Ya na nbipu di ilu;Ezé anumanu ka M'gēzikwasi kwa ha,Ya na edide nke ihe nākpu akpu nke ájá.

25 Mma-agha gāb͕aba madu aka nwa n'èzí,Oké ujọ gāb͕aba kwa n'ime-ulo nile;Ọ gēkpochapu ma okorọbia ma nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke,Nwa nāṅu ara tinyere onye-isi-awọ.

26 Asiwom, M'gāfupu ha,Me ka ncheta-ha kwusi n'etiti madu:

27 Ma ọ buru na atughm ujọ nkpasu-iwe onye-iro,Ka ndi nākpab͕u ha we ghara ichehie,Ka ha we ghara isi, Aka-ayi di elu,Ọ bughi Jehova meworo ihe a nile.

28 N'ihi na mba nke furu efu n'ebe idu-ọdu di ka ha bu,Nghọta adighi kwa nime ha.

29 Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na ha mara ihe, nwe kwa uche na nka,Ma asi na ha gāghọta ikpe-azu-ha!

30 Òtù onye gēsi aṅa chu nnù madu abua na ọgu iri,Màdu abua gēsi kwa aṅa me ka orú nnù madu na nnù madu ise b͕alaga,Ma ọ buru na Oké Nkume-ha ereghi ha,Ọ buru kwa na Jehova emechibidoghi ha uzọ?

31 N'ihi na oké nkume-ha adighi ka Oké Nkume-ayi,Ndi-iro-ayi bu kwa ndi-ikpe.

32 N'ihi na ọ bu n'osisi vine nke Sọdọm ka osisi vine ha sitere,Site kwa n'ubi Gọmọra:Nkpuru-vine-ha bu nkpuru-vine ńsí,Uyọkọ di ilu ka ha nwere:

33 Edide agwọ di ogologo ka manya-vine-ha bu,Na ńsí di irè nke aju-ala.

34 Ǹka abughi ihe akwakọbaworo n'ebe m'nọ,Ihe akaworo akàrà n'ulo-àkùm?

35 Mu nwe ọ́bọ̀ na nkwughachi,Na mb͕e ukwu-ha gāb͕uchapu:N'ihi na ubọchi nhuju-anya-ha di nso,Ihe nke ejikereworo ha nābia kwa ngwa ngwa.

36 N'ihi na Jehova gēkpeputa ndi-Ya,Cheghari kwa ncheghari bayere ndi-orù-Ya;Mb͕e Ọ nāhu na ihe-iye-aka-ha alawo,Ọ dighi kwa onye eb͕ochiri eb͕ochi ma-ọbu onye arapuru arapu fọduru.

37 Ọ gāsi kwa, Òle ebe chi nile ha nọ?Bú oké nkume nke ha b͕abàra nime ya;

38 Nke nēri abuba àjà nile ha,Nāṅu kwa manya-vine nke àjà-ihe-ọṅuṅu-ha;Ka ha bilie, yere unu aka,Ka ọ buru ebe-nzuzo n'elu unu.

39 Ub͕u a, hunu na Mu onwem, Mu onwem bu Ya,Ọ dighi kwa chi ọzọ Mu na ya nọ:Mu onwem nēme ka anwua, M'nēme kwa ka adi ndu;M'tib͕uwo etib͕u, Mu onwem gēme kwa ka aru di ike:Ọ dighi kwa onye nānaputa n'akam.

40 N'ihi na anameweli akam elu nye elu-igwe,We si, Mu onwem nādi ndu rue mb͕e ebighi-ebi,

41 Ọ buru na amuam mma-agham nēb͕upu àmùmà,O buru kwa na akam ejide ikpé;M'gābọghachi ọ́bọ̀ n'aru ndi nēmegidem,M'gākwughachi kwa ndi nākpọm asi.

42 M'gēme ka àkúm nile ṅubiga ọbara okè,Mma-agham gēri kwa anu-aru;Site n'ọbara ndi eb͕uru eb͕u na ndi adọtara n'agha,Site n'isi ndundu onye-iro.

43 Unu mba ọzọ, soronu ndi-Ya ti nkpu ọṅu:N'ihi na Ọ gābọ̀ ọ́bọ̀ ọbara ndi-orù-Ya,Ọ́bọ̀ ka Ọ gābọghachi kwa n'aru ndi nēmegide Ya,O gēkpuchi kwa nmehie ala-Ya na ndi-Ya.

44 Moses we bia, kwue okwu nile nke abù a na nti ndi Israel, ya onwe-ya, na Hoshea nwa Nun.

45 Moses we gwabìe Israel nile okwu nile ndia:

46 o we si ha, Tukwasi obi-unu n'okwu nile nke mu onwem nāb͕ara unu àmà ta; nke unu gēnye umu-unu n'iwu, ka ha lezie anya ime okwu nile nke iwu a.

47 N'ihi na ọ bughi ihe efu ka ọ bu n'ebe unu nọ; n'ihi na nka bu ndu-unu, ọ bu kwa ihe a ka unu gēwere me ka ubọchi-unu di anya n'elu ala, ebe unu onwe-unu nāgabiga Jọdan inweta ya.

48 Jehova we gwa Moses okwu n'otù ubọchi ahu, si,

49 Rigo n'ugwu a nke Abarim, bú ugwu Nebo, nke di n'ala Moab, nke di n'irú Jeriko; le kwa ala Kenean anya, bú nke Mu onwem nēnye umu Israel n'ihe-onwunwe:

50 gi nwu kwa n'ugwu ahu ebe i nārigo, ka achikọta kwa gi na umu-nna-gi n'ala-mọ; dika Eron, bú nwa-nne-gi, nwuru n'ugwu Hoa, ewe chikọta ya na umu-nna-ya n'ala-mọ:

51 n'ihi na unu mekpuru ihe-nmekpu megidem n'etiti umu Israel na miri Meriba Kedesh, n'ọzara Zin; n'ihi na unu edoghm nsọ n'etiti umu Israel.

52 N'ihi na ọ bu na ncherita-iru ka i gāhu ala ahu; ma i gaghi-abà n'ebe ahu n'ala ahu nke Mu onwem nēnye umu Israel.

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31 32 33 34