Deuteronomi 10 IGBOB

1 Na mb͕e ahu Jehova sirim, Wara onwe-gi mbadamba nkume abua dika nke-mbu, rigokutem rue ugwu a, me-kwa-ra onwe-gi ib͕e osisi.

2 M'gēdekwasi kwa na mbadamba nkume ahu okwu nile nke di n'elu mbadamba nkume mbu, nke i tupiara, i gētiye kwa ha nime ib͕e ahu.

3 M'we me ib͕e osisi acacia, wa mbadamba nkume abua dika nke-mbu, we rigo n'ugwu ahu, mbadamba nkume abua ahu di kwa n'akam.

4 O we dekwasi na mbadamba nkume ahu, dika odide mbu ahu si di, okwu iri ahu, nke Jehova gwara unu n'ugwu ahu site n'etiti ọku ahu n'ubọchi nkpọkọta ahu: Jehova we nyem ha.

5 M'we chigharia si n'ugwu ahu rida, tiye mbadamba nkume ahu nime ib͕e ahu nke m'mereri; ha di kwa n'ebe ahu, dika Jehova nyerem iwu.

6 (Umu Israel we si na Beerot Bene-jaakan bulie ije rue Mosira: n'ebe ahu ka Eron nwuru, ewe lìe ya n'ebe ahu; Eleeza, bú nwa-ya, we buru onye-nchu-àjà n'ọnọdu ya.

7 Ha si n'ebe ahu bulie ije rue Gudgoda, si na Gudgoda je rue Jọtbata, bú ala iyi miri.

8 Na mb͕e ahu ka Jehova kewaputara ebo Livai, ibū ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova, iguzo n'iru Jehova ijere Ya ozi, na igọzi n'aha-Ya, rue ta.

9 N'ihi ya Livai esoghi umu-nne-ya nwe òkè ma-ọbu ihe-nketa; Jehova onwe-ya bu ihe-nketa-ya, dika Jehova, bú Chineke-gi, gwara ya okwu.)

10 Mu onwem guzo-kwa-ra n'ugwu ahu, dika na mb͕e mbu, ọgu ubọchi abua, ehihie na abali: Jehova we gekwam nti na mb͕e ahu; Jehova achọghi ibibi gi.

11 Jehova we sim, Bilie, je ka i bulie ije n'iru ndi nkem; ha gābà kwa, nweta ala ahu, nke M'ṅuru ndi bu nna-ha iyi inye ha.

12 Ma ub͕u a, Israel, gini ka Jehova, bú Chineke-gi, nāriọ n'aka-gi, ma-ọbughi itu egwu Jehova, bú Chineke-gi, ije ije n'uzọ-Ya nile, na ihu Ya n'anya, na iwere obi-gi nile na nkpuru-obi-gi nile fè Jehova, bú Chineke-gi, òfùfè,

13 idebe ihe nile Jehova nyere n'iwu, na ukpuru-Ya nile, nke mu onwem nēnye gi n'iwu ta ka ọ we diri gi nma?

14 Le, Jehova, bú Chineke-gi, nwe elu-igwe, na elu-igwe nke elu-igwe nile, na uwa, na ihe nile nke di nime ya.

15 Nání na ihe nna-unu-hà di Jehova ezi utọ ka O we hu ha n'anya, O we rọputa nkpuru-ha nọchiri ha, bú unu onwe-unu, n'etiti ndi nile, otú ọ di ta.

16 Bì-kwa-nu obi-unu úgwù, unu abu-kwa-la ndi kwesiri olu ike ọzọ.

17 N'ihi na Jehova, bú Chineke-unu, Ya onwe-ya bu Chineke kachasi chi nile, na Onye-nwenu kachasi ndi-nwenu nile, Chineke uku ahu, bú dike, di kwa egwu, Onye nāhughi madu iru-ọma n'ikpé, Onye nānaraghi ihe-iri-ngo.

18 Ọ nēme ihe ekpere n'ikpe bayere nwa-nb͕ei na nwayi di-ya nwuru, Ọ nāhu kwa ọbìa n'anya, inye ya nri na uwe-nb͕okwasi.

19 Hu-kwa-nu ọbìa n'anya: n'ihi na ọ bu ndi-ọbìa ka unu buri n'ala Ijipt.

20 Jehova, bú Chineke-gi, ka i gātu egwu; Ya ka i gēfè, Ya ka i gārapara n'aru, aha-Ya ka i gēji ṅu iyi.

21 Ya Onwe-ya bu otuto-gi, Ya Onwe-ya bu kwa Chineke-gi, Onye meworo gi ihe uku ndia di egwu, nke anya-gi huworo.

22 Ọ bu ọgu madu atọ na iri ka nna-gi-hà ji rida n'Ijipt; ma ub͕u a Jehova, bú Chineke-gi, emewo gi ka i di ka kpakpando elu-igwe n'uba.

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31 32 33 34