8 Le, edowom ala ahu n'iru unu: banu, nweta ala ahu nke Jehova ṅuru nna-unu-hà iyi, bú Abraham na Aisak na Jekob, inye ha, inye kwa nkpuru-ha gānọchi ha.
9 M'we gwa unu okwu na mb͕e ahu, si, Apughm ibū unu náním:
10 Jehova, bú Chineke-unu, emewo ka unu ba uba, ma, le, unu di ka kpakpando elu-igwe n'uba, ta.
11 Jehova, bú Chineke nna-unu-hà, tukwasi unu madu kari ka unu ra nnù uzọ abua na ọgu uzọ iri, gọzi kwa unu, dika Ọ gwara unu!
12 M'gēsi aṅa, náním, bū ike-ọgwugwu-unu, na ibu-unu, na ise-okwu-unu?
13 Doro onwe-unu ndikom mara ihe, ndi nwe-kwa-ra nghọta, ndi ama-kwa-ra aha-ha, dika ebo nile unu si di, m'gēdo kwa ha ndi-isi-unu.
14 Unu we zam, si, Ihe nke i kwuworo di nma ime.