5 M'we chigharia si n'ugwu ahu rida, tiye mbadamba nkume ahu nime ib͕e ahu nke m'mereri; ha di kwa n'ebe ahu, dika Jehova nyerem iwu.
6 (Umu Israel we si na Beerot Bene-jaakan bulie ije rue Mosira: n'ebe ahu ka Eron nwuru, ewe lìe ya n'ebe ahu; Eleeza, bú nwa-ya, we buru onye-nchu-àjà n'ọnọdu ya.
7 Ha si n'ebe ahu bulie ije rue Gudgoda, si na Gudgoda je rue Jọtbata, bú ala iyi miri.
8 Na mb͕e ahu ka Jehova kewaputara ebo Livai, ibū ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova, iguzo n'iru Jehova ijere Ya ozi, na igọzi n'aha-Ya, rue ta.
9 N'ihi ya Livai esoghi umu-nne-ya nwe òkè ma-ọbu ihe-nketa; Jehova onwe-ya bu ihe-nketa-ya, dika Jehova, bú Chineke-gi, gwara ya okwu.)
10 Mu onwem guzo-kwa-ra n'ugwu ahu, dika na mb͕e mbu, ọgu ubọchi abua, ehihie na abali: Jehova we gekwam nti na mb͕e ahu; Jehova achọghi ibibi gi.
11 Jehova we sim, Bilie, je ka i bulie ije n'iru ndi nkem; ha gābà kwa, nweta ala ahu, nke M'ṅuru ndi bu nna-ha iyi inye ha.