11 ma ala ahu, ebe unu nāgabiga inweta ya, bu ala ugwu na ndagwurugwu; site na miri-ozuzo nke elu-igwe ka ọ nāṅu miri:
12 ọ bu ala nke di Jehova, bú Chineke-gi, n'obi; mb͕e nile ka anya Jehova, bú Chineke-gi, nādikwasi ya, site na mb͕e mbu nke arọ we rue mb͕e ikpe-azu nke arọ.
13 O gēru kwa, ọ buru na unu ejisie ike ige nti ihem nile enyere n'iwu, nke Mu onwem nēnye unu n'iwu ta, ihu Jehova, bú Chineke-unu, n'anya, na iwere obi-unu nile na nkpuru-obi-unu nile fè Ya òfùfè,
14 na m'gēnye miri-ozuzo ala-unu na mb͕e-ya, miri-ozuzo mbu na miri-ozuzo ikpe-azu, ka i we chikọta ọka-gi, na manya-vine ọhu gi, na manu-gi.
15 M'gēnye kwa anu-ulo-gi ihe-ọkuku n'ubi-gi, i gēri kwa, afọ gēju kwa gi.
16 Lezienu onwe-unu anya, ka ewe ghara irafu obi-unu, unu ewe wezuga onwe-unu, fè chi ọzọ òfùfè, kpọ isi ala nye ha;
17 iwe Jehova we di ọku megide unu, O we b͕ochie elu-igwe, ka miri-ozuzo we ghara idi, ka ala we ghara kwa imi ihe-ọmume-ya; unu we si n'ezi ala ahu, nke Jehova nēnye unu, la n'iyì ngwa ngwa.