1 Ndia bu ukpuru ahu na ikpé ahu, nke unu gēlezi anya ime n'ala ahu nke Jehova, bú Chineke nke nna-gi-hà, nyeworo gi ka i nweta ya, ubọchi nile nke unu onwe-unu nādi ndu n'elu ala ahu.
2 Unu aghaghi ime ka ebe ahu nile la n'iyì, bú ebe mba nile unu nēnweta fère chi nile ha òfùfè, n'elu ugwu nile ha di elu, na n'elu ugwu ntà nile ha, na n'okpuru osisi ndu ọ bula:
3 unu gākwatu kwa ebe-ichu-àjà nile ha, tupia ogidi nile ha, sure Asherim-ha n'ọku, b͕utu arusi nile apiri api nke chi nile ha, we me ka aha-ha lapu n'iyì n'ebe ahu.
4 Unu emerela Jehova, bú Chineke-unu, otú a.