18 kama ọ bu n'iru Jehova, bú Chineke-gi, ka i gēri ha, n'ebe ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, gārọputa, gi onwe-gi, na nwa-gi nwoke, na nwa-gi nwayi, na orù-gi nwoke, na orù-gi nwayi, na onye Livai nke nọ nime ọnu-uzọ-ama-gi ọ bula: i gāṅuri kwa ọṅu n'iru Jehova, bú Chineke-gi, na nseti aka-gi ọ bula.
19 Lezie onwe-gi anya ka i ghara irapu onye Livai ubọchi-gi nile n'elu ala-gi.
20 Mb͕e Jehova, bú Chineke-gi, gēme ka ókè-ala-gi sa mbara, dika Ọ gwara gi, i we si, Ka m'rie anu, n'ihi na agu nāgu nkpuru-obi-gi iri anu; n'agu nile nke nkpuru-obi-gi i gēri anu.
21 Mb͕e ọ gādikari gi anya, bú ebe ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, gārọputa itiye aha-Ya n'ebe ahu, i gēb͕u kwa ufọdu nime ìgwè ehi-gi na nime ìgwè ewu na aturu-gi, nke Jehova nyeworo gi, dika m'nyeworo gi iwu, i gēri kwa n'ọnu-uzọ-ama-gi ọ bula, n'agu nile nke nkpuru-obi-gi.
22 Nání, dika anēri mb͕ada na ele, otú a ka i gēri ha: onye ruru árú na onye di ọcha gēri ha n'otù uzọ ahu.
23 Nání, di ike ka i ghara iri ọbara: n'ihi na ọbara bu ndu; eri-kwa-la ndu tiyere anu.
24 Erila ya; i gāwusi ya n'ala dika miri.