22 Nání, dika anēri mb͕ada na ele, otú a ka i gēri ha: onye ruru árú na onye di ọcha gēri ha n'otù uzọ ahu.
23 Nání, di ike ka i ghara iri ọbara: n'ihi na ọbara bu ndu; eri-kwa-la ndu tiyere anu.
24 Erila ya; i gāwusi ya n'ala dika miri.
25 Erila ya; ka o we diri gi nma, di-kwa-ra umu-gi gānọchi gi, mb͕e i gēme ihe ziri ezi n'anya Jehova.
26 Nání ihe nsọ gi nile nke i nwere, na ihe-nkwa-gi nile, ka i gēbuli, biarue ebe ahu nke Jehova gārọputa:
27 i gāchu kwa aja-nsure-ọku-gi nile, anu na ọbara, n'elu ebe-ichu-àjà nke Jehova, bú Chineke-gi: agāwukwasi kwa ọbara nke àjà-gi nile n'ebe-ichu-àjà nke Jehova, bú Chineke-gi, ma i gēri anu-ha.
28 Riba okwu ndia nile ama, nu kwa ha, bú nke mu onwem nēnye gi n'iwu, ka ọ we diri gi nma, di-kwa-ra umu-gi gānọchi gi rue mb͕e ebighi-ebi, mb͕e i nēme ihe di nma nke ziri ezi n'anya Jehova, bú Chineke-gi.