16 na okwukwu ntà, na okwukwu uku, na okwukwu nwere mpi;
17 na okwolo, na udele, na cormorant;
18 na ub͕ala, na utù di iche iche, na hoopoe, na usu.
19 Anu-ufe ọ bula nke nēnuputa enuputa, ihe-árú ka ọ buru unu; agaghi-eri ha.
20 Anu-ufe ọ bula nke di ọcha ka unu gēri.
21 Unu erila ihe nwuru onwe-ya: ọ bu ọbìa nke nọ nime ọnu-uzọ-ama-gi ọ bula ka i gēnye ya, ka ọ we rie ya; ma-ọbu i gērenye ya onye ala ọzọ: n'ihi na ndi nsọ ka i buru Jehova, bú Chineke-gi. Esila nwa-ewu nime miri-ara nke nne-ya.
22 I ghaghi inye otù uzọ n'uzọ iri nke ihe-ọmume nile nke nkpuru-gi, bú ihe nke nēsi n'ubi-gi puta kwa-arọ.