1 Achurula Jehova, bú Chineke-gi, ehi, ma-ọbu aturu, nke ọlu di n'aru-ya, bú ihe ọjọ ọ bula: n'ihi na ihe-árú nke Jehova, bú Chineke-gi, ka ọ bu.
2 Mb͕e agāhuta n'etiti gi, n'otù nime ọnu-uzọ-ama-gi nile nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi, nwoke ma-ọbu nwayi, nke nēme ihe jọrọ njọ n'anya Jehova, bú Chineke-gi, n'igabiga ọb͕ub͕a-ndu-Ya,
3 nke jewo-kwa-ra fè chi ọ bula ọzọ òfùfè, we kpọ isi ala nye ha, ma-ọbu inye anyanwu, ma-ọbu inye ọnwa, ma-ọbu inye ihe ọ bula nime usu ihe elu-igwe, nke m'nēnyeghi n'iwu;
4 ewe gosi gi ya, i we nu ya, i gāju kwa ase nke-ọma, ma, le asi na ọ bu ezi-okwu, okwu ahu eguzosi ike, na emewo ihe-árú ahu n'Israel;
5 i gēme kwa ka nwoke ahu ma-ọbu nwayi ahu puta, bú ndi meworo ihe ọjọ a, rue ọnu-uzọ-ama-gi ọ bula, ọbuná nwoke ahu ma-ọbu nwayi ahu; i gēwere nkume tub͕ue ha, ka ha nwua.