10 ka ewe ghara iwusi ọbara nēmeghi ihe ọjọ n'etiti ala-gi, nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi ka ọ buru ihe-nketa, ọbara we dikwasi gi n'isi.
11 Ma mb͕e nwoke ọ bula bu onye nākpọ madu-ibe-ya asì, o we che ya anwu, bilie megide ya, tipu ndu-ya, o we nwua; ob͕u-madu ahu we b͕alaga n'otù nime obodo ndia:
12 ndi-okenye obodo-ya gēzì kwa kpọputa ya n'ebe ahu, were ya nye n'aka onye-ọ́bọ̀ ọbara, ka o we nwua.
13 Anya-gi agaghi-emere ya ebere, ma i gēkpochapu n'Israel ọbara nke onye nēmeghi ihe ọjọ, ka o we diri gi nma.
14 Ewezugala ókè-ala ab͕ata-obi-gi, nke ndi mbu akpawo, n'ihe-nketa-gi nke i gēketa, n'ala ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi ka i nweta ya.
15 Nání otù onye-àmà agaghi-ebili imegide onye ọ bula bayere ajọ omume ọ bula, ma-ọbu bayere nmehie ọ bula, nime nmehie ọ bula nke ọ nēmehie: n'ọnu ndi-àmà abua, ma-ọbu n'ọnu ndi-àmà atọ, ka okwu gēguzosi ike.
16 Mb͕e onye-àmà nke ihe-ike gēbili megide onye ọ bula ib͕agide ya àmà bayere nwezuga;