11 Refaim ka anāgu kwa ndia, dika ndi Anak; ma ndi Moab nākpọ ha Imim.
12 Ọ bu kwa na Sia ka ndi Hoa bi na mb͕e gara aga, ma umu Isọ napuru ha ala-ha; ha we kpochapu ha n'iru ha, bichie n'ọnọdu ha; dika umu Israel mere ala nke ihe-nnweta-ya, nke Jehova nyere ha.)
13 Ub͕u a, bilienu, gabiga miri-iyi Zered n'onwe-unu. Ayi we gabiga miri-iyi Zered.
14 Ubọchi nile nke ayi siri na Kedesh-banea je ije, rue mb͕e ayi gabigara miri-iyi Zered, di orú arọ na iri na asatọ; rue mb͕e ọb͕ọ nile nke ndikom agha si n'etiti ọmuma-ulo-ikwū gwusia, dika Jehova ṅuru ha iyi.
15 Ọzọ kwa, aka Jehova digidere ha, ikpochapu ha n'etiti ọmuma-ulo-ikwū, rue mb͕e emere ka ha gwusia.
16 Ọ we rue, mb͕e ndikom agha ahu nile nwupusiri n'etiti ndi Israel,
17 na Jehova gwaram okwu, si,