27 Ka m'gabiga n'ala-gi: n'uzọ n'uzọ ka m'ganēje, m'gaghi-ewezuga onwem n'aka-nri, ma-ọbu n'aka-ekpe.
28 N'ego ka i gērenyem ihe-oriri, ka m'we rie; n'ego ka i gēnyekwam miri, ka m'we ṅua: nání kwe ka m'gabiga n'ukwum;
29 dika umu Isọ ndi bi na Sia, na ndi Moab ndi bi na ya merem; rue mb͕e m'gāgabiga Jọdan, ba n'ala ahu nke Jehova, bú Chineke-ayi, nēnye ayi.
30 Ma Saihon, bú eze Heshbon, achọghi ka ayi gabiga n'ala-ya: n'ihi na Jehova, bú Chineke-gi, mere mọ-ya ka ọ di ike, b͕a kwa obi-ya ume, ka O we nye ya n'aka-gi, otú ọ di ta.
31 Jehova we sim, Le, amalitewom irara Saihon na ala-ya nye n'iru gi: malite inweta, ka i we nweta ala-ya.
32 Saihon we puta izute ayi, ya onwe-ya na ndi-ya nile, ibu agha, rue Jehaz.
33 Jehova, bú Chineke-ayi, we rara ya nye n'iru ayi, ayi we tib͕ue ya, na umu-ya ndikom, na ndi-ya nile.