13 Mb͕e nwoke gāluru nwunye, bakuru ya, kpọ ya asì,
14 we bo ya ebubo ihere, we weta aha ọjọ n'isi ya, si, Nwayi a ka m'luru na nwunye, m'we biarue ya nso, ma achọtaghm n'aru ya ihe nēgosi na ọ bu nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke:
15 nna nwa-ab͕ọghọ ahu, na nne-ya, gēwere kwa ihe nēgosi na nwa-ab͕ọghọ ahu bu onye nāmaghi nwoke, ha gēweputa-kwa-ra ha ndi-okenye obodo, rue ọnu-uzọ-ama:
16 nna nwa-ab͕ọghọ ahu gāsi kwa ndi-okenye ahu, Nwam nwayi ka m'nyere nwoke a na nwunye, o we kpọ ya asì;
17 ma, le, nwoke a ebowo ya ebubo ihere, si, Achọtaghm n'aru nwa-gi nwayi ihe nēgosi na ọ bu nwayi nāmaghi nwoke; ma ndia bu ihe nēgosi na nwam nwayi bu nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke. Ha gāb͕asa kwa uwe-nb͕okwasi-ya n'iru ndi-okenye obodo ahu.
18 Ndi-okenye obodo ahu gēwere nwoke ahu dọ ya aka na nti;
19 ha gēri kwa ya nra ọgu shekel ọla-ọcha ise, nye nna nke nwa-ab͕ọghọ ahu, n'ihi na o wetawo aha ọjọ n'isi nwa-ab͕ọghọ nke Israel nāmaghi nwoke: ya ka ọ gābu-kwa-ra nwunye; ọ pughi ichupu ya ubọchi-ya nile.