20 onye ala ọzọ ka i gēbinye ihe n'uma; ma ebinyela nwa-nne-gi ihe n'uma: ka Jehova, bú Chineke-gi, we gọzie gi na nseti aka-gi nile, n'elu ala ahu ebe gi onwe-gi nābà inweta ya.
21 Mb͕e i gēkwe Jehova, bú Chineke-gi, nkwa, alala azu n'ikwughachi ya: n'ihi na Jehova, bú Chineke-gi, aghaghi iju ase ya n'aka-gi; ọ gābu kwa nmehie nime gi.
22 Ma mb͕e i ghara ikwe nkwa, ọ gaghi-abu nmehie nime gi.
23 Ihe nke nēsi n'eb͕ub͕ere-ọnu-gi puta ka i gēdebe, me kwa; dika i kweworo Jehova, bú Chineke-gi, nkwa, ọ bu onyinye-afọ-ofufo, nke i kwuworo n'ọnu-gi.
24 Mb͕e ọ bula i nābà n'ubi-vine nke ab͕ata-obi-gi, i gēri kwa nkpuru-vine, dika nkpuru-obi-gi si achọ, nke gēju gi afọ; ma etiyela nkpuru ọ bula n'ihe-gi.
25 Mb͕e ọ bula i nābà n'ọka guzoro eguzo nke ab͕ata-obi-gi, i gāghọrọ oko ọka n'aka-gi; ma ewegharila mma-iwe-ihe-ubi n'elu ọka guzoro eguzo nke ab͕ata-obi-gi.