4 n'ihi na ha ejighi achicha na miri bia n'iru unu n'uzọ, mb͕e unu siri n'Ijipt puta; na n'ihi na ha gotara Belam nwa Beoa imegide gi site na Petoa nke Mesọpọtemia, ikọcha gi.
5 Ma Jehova, bú Chineke-gi, ekweghi ige Belam nti; kama Jehova, bú Chineke-gi, b͕anwere nkọcha ahu ka ọ ghọrọ gi ngọzi, n'ihi na Jehova, bú Chineke-gi, huru gi n'anya.
6 Achọla udo-ha na ọdi-nma-ha ubọchi-gi nile rue mb͕e ebighi-ebi.
7 Akpọla onye Edom ihe árú; n'ihi na nwa-nne-gi ka ọ bu: akpọla onye Ijipt ihe-árú; n'ihi na ọbìa ka i buri n'ala-ya.
8 Umu agāmuru ha, ọb͕ọ nke-atọ ha, gābà nime nkpọkọta Jehova.
9 Mb͕e i nāpu dika ọmuma-ulo-ikwū imegide ndi-iro-gi, i gēdebe kwa onwe-gi pua n'ihe ọjọ ọ bula.
10 Mb͕e nwoke ọ bula di n'etiti unu, nke nādighi ọcha, site n'ihe mere ya n'abali, ọ gāpu kwa je n'azu ọmuma-ulo-ikwū, ọ gaghi-abà n'etiti ọmuma-ulo-ikwū: