19 Mb͕e i nēwe ihe-ubi n'ubi-gi, i we chezọ ùkwù ọka n'ubi, ejeghachila iweta ya: ọbìa, na nwa-nb͕ei, na nwayi di-ya nwuru, ka ọ gādiri: ka Jehova, bú Chineke-gi, we gọzie gi n'omume aka-gi nile.
20 Mb͕e i nētisisi nkpuru osisi olive gi, eletala alaka-ya ọzọ n'azu gi: ọbìa, na nwa-nb͕ei, na nwayi di-ya nwuru, ka ọ gādiri.
21 Mb͕e i nāghọrọ nkpuru ubi-vine-gi, atutukọla nkpuru-ya fọduru n'azu gi: ọbìa, na nwa-nb͕ei, na nwayi di-ya nwuru, ka ọ gādiri.
22 I gēcheta kwa na orù ka i buri n'ala Ijipt: n'ihi nka ka m'nēnye gi iwu ime ihe a.