6 Madu agaghi-ewere nkume-igwe-nri ma-ọbu aka-nkume n'ihe-ibe: n'ihi na ndu madu ka onye ahu nēwere n'ihe-ibe.
7 Mb͕e agāhu onye ọ bula ka o nēzu madu n'ori sitere n'umu-nne-ya, sitere n'umu Israel, o we nēme ya dika orù, ma-ọbu re ya; onye-ori ahu gānwu kwa: i we kpochapu ihe ọjọ ahu n'etiti gi.
8 Lezie onwe-gi anya n'ihe-otiti ekpenta, ilezi anya nke-ọma, na ime dika ihe nile si di nke ndi-nchu-àjà, bú ndi Livai, gēzí unu: dika m'nyere ha iwu, otú a ka unu gēlezi anya ime.
9 Cheta ihe ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, mere Miriam, n'uzọ, mb͕e unu siri n'Ijipt puta.
10 Mb͕e i nēbinye madu-ibe-gi ihe-nbinye ọ bula, abala n'ulo-ya iwere ihe-ibe-ya.
11 N'èzí ka i gēguzo, nwoke ahu onye gi onwe-gi nēbinye ihe gēweputa-kwa-ra gi ihe-ibe-ya n'èzí.
12 Ma ọ buru na onye ewedara n'ala ka ọ bu, ewela ihe-ibe-ya dina ala: