8 Lezie onwe-gi anya n'ihe-otiti ekpenta, ilezi anya nke-ọma, na ime dika ihe nile si di nke ndi-nchu-àjà, bú ndi Livai, gēzí unu: dika m'nyere ha iwu, otú a ka unu gēlezi anya ime.
9 Cheta ihe ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, mere Miriam, n'uzọ, mb͕e unu siri n'Ijipt puta.
10 Mb͕e i nēbinye madu-ibe-gi ihe-nbinye ọ bula, abala n'ulo-ya iwere ihe-ibe-ya.
11 N'èzí ka i gēguzo, nwoke ahu onye gi onwe-gi nēbinye ihe gēweputa-kwa-ra gi ihe-ibe-ya n'èzí.
12 Ma ọ buru na onye ewedara n'ala ka ọ bu, ewela ihe-ibe-ya dina ala:
13 i ghaghi inyeghachi ya ihe-ibe ahu mb͕e anyanwu nāda, ka o we dina ala n'uwe-ya, we gọzie gi: o we buru gi ezi omume n'iru Jehova, bú Chineke-gi.
14 Emeb͕ula onye egoro ọlu nke bu onye ewedera n'ala na ob͕eye, ma o sitere n'umu-nne-gi, ma-ọbu na o sitere na ndi-ọbìa-gi ndi nọ n'ala-gi nime ọnu-uzọ-ama-gi ọ bula.