18 Onye anābu ọnu ka ọ bu, bú onye nēme onye-ìsì ka ọ jehie n'uzọ. Ndi Israel nile gāsi kwa, Amen.
19 Onye anābu ọnu ka ọ bu, bú onye nēwezuga ikpé nke ọbìa, na nke nwa-nb͕ei, na nke nwayi di-ya nwuru. Ndi Israel nile gāsi kwa, Amen.
20 Onye anābu ọnu ka ọ bu, bú onye ya na nwunye nna-ya nēdina; n'ihi na o kpughewo uwe kpuchiri ọtọ nna-ya. Ndi Israel nile gāsi kwa, Amen.
21 Onye anābu ọnu ka ọ bu, bú onye ya na anumanu ọ bula nēdina. Ndi Israel nile gāsi kwa, Amen.
22 Onye anābu ọnu ka ọ bu, bú onye ya na nwa-nne-ya nwayi nēdina, bú nwa-nwayi nke nna-ya, ma-ọbu nwa-nwayi nke nne-ya. Ndi Israel nile gāsi kwa, Amen.
23 Onye anābu ọnu ka ọ bu, bú onye ya na nne-nwunye-ya nēdina. Ndi Israel nile gāsi kwa, Amen.
24 Onye anābu ọnu ka ọ bu, bú onye nētib͕u madu-ibe-ya na nzuzo. Ndi Israel nile gāsi kwa, Amen.