1 Ndia bu okwu ọb͕ub͕a-ndu ahu nke Jehova nyere Moses n'iwu ka ya na umu Israel b͕a n'ala Moab, nāgughi ọb͕ub͕a-ndu ahu nke Ya na ha b͕ara nime Horeb.
2 Moses we kpọ Israel nile òkù, si ha, Unu onwe-unu ahuwo ihe nile nke Jehova mere Fero, me kwa ndi-orù-ya nile, me kwa ala-ya nile, n'anya-unu n'ala Ijipt;
3 ọnwunwa uku nile nke anya-gi huru, ihe-iriba-ama nile, na ihe-ebube uku ahu nile:
4 ma Jehova enyeghi unu obi imara ama, na anya ihu ahu, na nti inu anu, rue ta.
5 Emewokwam ka unu je ije ọgu arọ abua n'ọzara: uwe-unu akapughi nká n'aru unu, akpukpọ-ukwu-gi akapughi nká n'ukwu-gi.
6 Ọ dighi achicha unu riworo, ọ dighi kwa manya-vine ma-ọbu ihe-ọṅuṅu nke nābà n'anya unu ṅuworo: ka unu we mara na mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu.