9 Debe-kwa-nu okwu nile nke ọb͕ub͕a-ndu a, me kwa ha, ka unu we nwe uche n'ihe nile nke unu nēme.
10 Unu onwe-unu nēguzo ta, unu nile, n'iru Jehova, bú Chineke-unu; ndi-isi-unu, na ebo nile unu, na ndi-okenye-unu, na ndi-odozi-okwu-unu, bú nwoke ọ bula nke Israel,
11 umu-ntakiri-unu, na ndinyom-unu, na ọbìa-gi nke nọ n'etiti ọmuma-ulo-ikwū-gi nile, site n'onye nāwa nkú-gi rue onye nēsere miri-gi:
12 ka i we gabiga ba n'ọb͕ub͕a-ndu nke Jehova, bú Chineke-gi, na n'iṅu-iyi-Ya, nke gi na Jehova, bú Chineke-gi, nāb͕a ta:
13 ka O we me ka i guzosiere Ya ike ta ibu otù ndi, ka Ya onwe-ya we buru-kwa-ra gi Chineke, dika Ọ gwara gi, na dika Ọ ṅuru nna-gi-hà iyi, bú Abraham, na Aisak, na Jekob.
14 Ọ bughi kwa nání unu ka mu onwem nāb͕a ọb͕ub͕a-ndu a na iṅu-iyi a nye;
15 kama ọ bu onye nọ n'ebe a n'etiti ayi nēguzo ta n'iru Jehova, bú Chineke-ayi, ọ bu kwa onye nānọghi n'ebe a n'etiti ayi ta: