22 Moses we de abù a n'akwukwọ n'ubọchi ahu, zí kwa ya umu Israel.
23 O we nye Joshua nwa Nun iwu, si, Di ike, nwe kwa ume: n'ihi na gi onwe-gi gēme ka umu Israel ba n'ala ahu nke M'ṅuru ha iyi inye ha: Mu onwem gānọye-kwa-ra gi.
24 O rue, mb͕e Moses debisiri okwu nile nke iwu a n'akwukwọ, rue mb͕e edezuru ha,
25 na Moses nyere ndi Livai, ndi nēbu ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova, iwu, si,
26 Were akwukwọ iwu a, tiye ya n'akuku ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova, bú Chineke-unu, ka o we di n'ebe ahu ibu ihe-àmà megide gi.
27 N'ihi na mu onwem amawo nnupu-isi-gi, na nkwesi-olu-ike-gi: le, mb͕e m'nānọ ndu n'etiti unu ta, unu aburuwo ndi nānupu isi n'okpuru Jehova; ùnu gēsi aṅa ghara inupu isi kari nke-uku mb͕e ọnwum gasiri?
28 Kpọkọtaranum ndi-okenye nile nke ebo nile unu, na ndi-odozi-okwu-unu, ka m'kwu kwa okwu ndia na nti-ha, me ka elu-igwe na ala b͕a àmà megide ha.