4 Jehova gēme kwa ha dika O mere Saihon, me kwa Og, bú ndi-eze ndi-Amorait, me kwa ala-ha; ndi O kpochapuru.
5 Jehova gāra kwa ha nye n'iru unu, unu gēme kwa ha dika ihe nile enyere n'iwu si di, nke m'nyeworo unu n'iwu.
6 Dinu ike, nwe-kwa-nu ume, unu atula egwu, unu ama-kwa-la jijiji n'iru ha; n'ihi na Jehova, bú Chineke-gi, Ya onwe-ya bu onye gi na Ya nēje; Ọ gaghi-ara gi aka, Ọ gaghi-arapu kwa gi.
7 Moses we kpọ Joshua òkù, si ya n'anya Israel nile, Di ike, nwe kwa ume: n'ihi na gi onwe-gi gēsoro ndi nka ba n'ala ahu nke Jehova ṅuru ndi bu nna-ha iyi ínye ha; gi onwe-gi gēme kwa ka ha keta ya.
8 Jehova kwa, Ya onwe-ya bu onye nēje n'iru gi; Ọ gānọyere gi, Ọ gaghi-ara gi aka, Ọ gaghi-arapu kwa gi: atula egwu, atu-kwa-la ujọ.
9 Moses we de iwu a n'akwukwọ, were ya nye ndi-nchu-àjà, bú umu Livai, ndi nēbu ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova, ọ nye kwa ndi-okenye nile nke Israel.
10 Moses we nye ha iwu, si, N'ọgwugwu arọ asa, na mb͕e akara àkà nke arọ nrapu ahu, n'ememe ulo-ntu,