42 M'gēme ka àkúm nile ṅubiga ọbara okè,Mma-agham gēri kwa anu-aru;Site n'ọbara ndi eb͕uru eb͕u na ndi adọtara n'agha,Site n'isi ndundu onye-iro.
43 Unu mba ọzọ, soronu ndi-Ya ti nkpu ọṅu:N'ihi na Ọ gābọ̀ ọ́bọ̀ ọbara ndi-orù-Ya,Ọ́bọ̀ ka Ọ gābọghachi kwa n'aru ndi nēmegide Ya,O gēkpuchi kwa nmehie ala-Ya na ndi-Ya.
44 Moses we bia, kwue okwu nile nke abù a na nti ndi Israel, ya onwe-ya, na Hoshea nwa Nun.
45 Moses we gwabìe Israel nile okwu nile ndia:
46 o we si ha, Tukwasi obi-unu n'okwu nile nke mu onwem nāb͕ara unu àmà ta; nke unu gēnye umu-unu n'iwu, ka ha lezie anya ime okwu nile nke iwu a.
47 N'ihi na ọ bughi ihe efu ka ọ bu n'ebe unu nọ; n'ihi na nka bu ndu-unu, ọ bu kwa ihe a ka unu gēwere me ka ubọchi-unu di anya n'elu ala, ebe unu onwe-unu nāgabiga Jọdan inweta ya.
48 Jehova we gwa Moses okwu n'otù ubọchi ahu, si,