17 Nwa ehi-ya buru uzọ mu, ima-nma diri ya;Mpi nke atu ka mpi-ya abua bu kwa:Ọ gēwere ha sọkọta ndi nile, rue nsọtu nile nke uwa:Ndi ahu bu kwa usu nile nke orú nnù ndikom na nnù ise nke Efraim,Ndi ahu bu kwa usu nile nke nnù ndikom abua na ọgu iri nke Manase.
18 Ọ we kwue ihe bayere Zebulun, si,Zebulun, ṅuria ọṅu n'ọpupu-gi;Isaka, ṅuri kwa ọṅu n'ulo-ikwū-gi nile.
19 Ha gākpọ ndi nile bia n'ugwu;N'ebe ahu ka ha gāchu àjà ezi omume:N'ihi na njuputa nke oké osimiri nile ka ha gāmí dika ara,Ya na ihe nile zoro ezo nke ezoro n'ájá.
20 Ọ we kwue ihe bayere Gad, si,Onye agọziri agọzi ka Ọ bu, bú Onye nēme ka Gad sa mbara:Dika nne-ọdum ka ọ nēbi,Ọ nādọka kwa ogwe-aka, ya na opu-n'isi.
21 Ọ nāhuta-kwa-ra onwe-ya ihe mbu,N'ihi na ebe ahu ka ekpuchiri òkè onye nēnye iwu;Ọ we soro ndi-isi ndi Israel bia,Ezi omume nke Jehova ka o mere,Na ikpé-Ya nile n'ebe Israel nọ.
22 O we kwue ihe bayere Dan, si,Dan bu nwa ọdum,Ọ nēsi na Beshan maputa.
23 O we kwue ihe bayere Naftali, si,Naftali, onye ewere ihe-utọ me ka afọ ju gi,Onye juputa-kwa-ra na ngọzi Jehova:Gi nweta Ọdida-anyanwu na Ndida.