4 Iwu ka Moses nyere ayi,Bú ihe-nnweta nke nkpọkọta Jekob.
5 Ọ we buru eze nime Jeshurun,Mb͕e ndi-isi ndi Israel chikọtara onwe ha,Ebo nile nke Israel n'otù.
6 Ka Reuben di ndu, ghara kwa inwu;Ma ka ndikom-ya di ole-na-ole.
7 Nka bu kwa ngọzi nke Juda: ọ we si,Jehova, nu olu Juda,Me kwa ka ọ bakute ndi-ya:Aka-ya abua aluworo ya onwe-ya ọ̀gù;Onye-iye-aka megide ndi nākpab͕u ya ka I gābu.
8 Ọ we kwue ihe bayere Livai, si,Izu-okè-Gi na Ìhè-Gi diri onye-ebere-Gi,Onye I nwara na Masa,Onye Gi na ya nēse okwu n'akuku miri Meriba;
9 Onye ahu nke nēkwu okwu bayere nna-ya, baye-kwa-ra nne-ya, si, Ahughm ya;Umu-nne-ya ka ọ nāmataghi kwa;Umu-ya ka ọ nāmaghi kwa;N'ihi na ha edebewo okwu-ọnu-Gi,Ọb͕ub͕a-ndu-Gi ka ha nēchezi kwa.
10 Ha gēzí Jekob ikpé-Gi nile,Iwu-Gi ka ha gēzí kwa Israel:Ha gētiye ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'imi-Gi,Tiye kwa àjà-nsuresi-ọku n'elu ebe-ichu-àjà-Gi.