8 Ọ we kwue ihe bayere Livai, si,Izu-okè-Gi na Ìhè-Gi diri onye-ebere-Gi,Onye I nwara na Masa,Onye Gi na ya nēse okwu n'akuku miri Meriba;
9 Onye ahu nke nēkwu okwu bayere nna-ya, baye-kwa-ra nne-ya, si, Ahughm ya;Umu-nne-ya ka ọ nāmataghi kwa;Umu-ya ka ọ nāmaghi kwa;N'ihi na ha edebewo okwu-ọnu-Gi,Ọb͕ub͕a-ndu-Gi ka ha nēchezi kwa.
10 Ha gēzí Jekob ikpé-Gi nile,Iwu-Gi ka ha gēzí kwa Israel:Ha gētiye ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'imi-Gi,Tiye kwa àjà-nsuresi-ọku n'elu ebe-ichu-àjà-Gi.
11 Jehova, gọzie àkù-ya,Ka ọlu aka-ya abua tọ kwa Gi utọ:Mapue úkwù ndi nēbili imegide ya,Na nke ndi nākpọ ya asì, ka ha ghara ibili ọzọ.
12 O kwuru ihe bayere Benjamin, si,Onye Jehova huru n'anya gēbi na ntukwasi-obi n'akuku Ya;O nēkpuchi ya ogologo ubọchi nile,Ọ bu kwa n'etiti ubu-Ya abua ka o nēbi.
13 Ọ we kwue ihe bayere Josef, si,Ihe Jehova nāgọzi ka ala-ya bu;Site n'ihe di oké ọnu-ahia nke elu-igwe, site n'igirigi,Site kwa n'ob͕u-miri nke nāmakpu n'okpuru.
14 Site kwa n'ihe di oké ọnu-ahia nke ihe-ọmume anyanwu,Site kwa n'ihe di oké ọnu-ahia nke ihe-npuputa nke ọnwa nile.