1 Moses we si n'ala ihe nādighi nke Moab rigorue ugwu Nebo, rue elu Pisga, nke di n'iru Jeriko. Jehova we me ka ọ hu ala ahu nile; Gilead, rue Dan;
2 na Naftali nile, na ala nke Efraim na Manase, na ala nile nke Juda, rue oké osimiri nke di n'azu;
3 na Negeb, na Buruburu-ala nke ndagwurugwu Jeriko, bú obodo nkwu, rue Zoa.
4 Jehova we si ya, Nka bu ala ahu nke M'ṅuru Abraham iyi, ṅu-kwa-ra Aisak, ṅu-kwa-ra Jekob, si, Ọ bu nkpuru-gi ka M'gēnye ya: emewom ka i were anya-gi abua hu ya, ma i gaghi-agabiga n'ebe ahu.
5 Moses, bú orù Jehova, we nwua n'ebe ahu n'ala Moab, n'okwu-ọnu Jehova.