32 N'ihi na biko, jua ajuju bayere ubọchi nile gara aga, nke buru gi uzọ, site n'ubọchi mb͕e Chineke kere madu n'elu uwa, site kwa n'otù nsọtu elu-igwe we rue nsọtu elu-igwe ọzọ, ma ihe dika ihe uku a adiwo, ma-ọbu na anuwo ihe di ka ya.
33 Ọ̀di ndi ọ bula nuru olu Chineke ka o nēsi n'etiti ọku kwue okwu, dika gi onwe-gi nuworo, we di ndu?
34 Ma-ọbu Chineke, Ọ̀ nwawo ibà nime otù mba isi n'etiti ya were n'Onwe-ya mba ọzọ, n'ọnwunwa di iche iche, na n'ihe-iriba-ama di iche iche, na n'ihe-ebube di iche iche, na n'agha, na n'aka di ike, na n'ogwe-aka esetiri eseti, na n'oké egwu di iche iche, dika ihe nile si di nke Jehova, bú Chineke-unu, mere unu n'Ijipt n'anya-unu?
35 Emewo ka gi onwe-gi hu ya, ka i we mara na Jehova, Ya onwe-ya bu Chineke; ọ dighi onye ọzọ ma-ọbughi Ya;
36 N'elu-igwe ka O si me ka i nu olu-Ya, ka O we dọ gi aka na nti: n'elu uwa ka O me-kwa-ra gi ka i hu ọku uku Ya; i we nu okwu-Ya nile site n'etiti ọku ahu.
37 Ma n'ihi na Ọ huru nna-gi-hà n'anya, O we rọputa nkpuru-ha nọchiri ha, O we were ike uku Ya me ka i si n'Ijipt puta n'iru Ya;
38 ka O we napu mba uku di kwa ike kari gi ala-ha n'iru gi, ime ka i ba, ka O we nye gi ala-ha ibu ihe-nketa, otú ọ di ta.