39 I mawo kwa ta, cheta-kwa-ra obi-gi, na Jehova, Ya onwe-ya bu Chineke n'elu-igwe di n'elu na n'elu uwa di n'okpuru: ọ dighi onye ọzọ.
40 I gēdebe kwa ukpuru-Ya nile, na ihe nile O nyere n'iwu, nke Mu onwem nēnye gi n'iwu ta, ka o we diri gi nma, di-kwa-ra umu-gi gānọchi gi, ka i we me kwa ka ubọchi-gi di anya n'elu ala ahu, nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi, ubọchi nile.
41 Mb͕e ahu Moses kpaputara obodo atọ n'ofè Jọdan n'uzọ ọwuwa-anyanwu;
42 ka ob͕u-madu we b͕alaga n'ebe ahu, bú onye nēb͕u ab͕ata-obi-ya nāmaghi ama, ma ya onwe-ya akpọghi ya asì na mb͕e gara aga; ka ọ we b͕alaga n'otù nime obodo ahu, we di ndu:
43 bú Biza nime ọzara, n'ala ahu di lari, ka ọ diri ndi Reuben; na Remot nime Gilead, ka ọ diri ndi Gad; na Golan nime Beshan, ka ọ diri ndi Manase.
44 Nka bu kwa iwu ahu nke Moses doro n'iru umu Israel:
45 ndia bu ihe-àmà, na ukpuru, na ikpé, nke Moses gwara umu Israel, mb͕e ha si n'Ijipt puta;