1 Nuru, Israel: gi onwe-gi nāgabiga Jọdan ta, ibà ka i we nweta mba di iche iche di uku di kwa ike kari gi, obodo di iche iche di uku nke ewusi-kwa-ra ike rue elu-igwe;
2 otù ndi di uku di kwa ogologo, bú umu ndi Anak, ndi gi onwe-gi mara, ndi gi onwe-gi nuwo-kwa-ra okwu bayere ha, si, Ònye gēguzo onwe-ya n'iru umu Anak?
3 Ma i mawo ta, na Jehova, bú Chineke-gi, Ya onwe-ya bu onye nāgabiga n'iru gi dika ọku nēripia eripia; Ya onwe-ya gēkpochapu ha, Ya onwe-ya gēme kwa ka ha ruru ala n'iru gi: i we napu ha ala-ha, me kwa ka ha la n'iyì ngwa ngwa, dika Jehova gwaworo gi okwu.
4 Ekwula n'obi-gi, mb͕e Jehova, bú Chineke-gi, kwapusiri ha n'iru gi, si, N'ihi ezi omumem ka Jehova mere ka m'bata inweta ala nka: ma ọ bu n'ihi nmebi-iwu nke mba ndia ka Jehova nānapu ha ala-ha n'iru gi.