13 Ma oyiyi nke ihe anọ ahu di ndu, ka ha si di n'ile ha anya, ha di ka icheku ọku nēre ọku, dika ọwa n'ile ha anya; ọku ahu nāga iru na azu n'etiti ihe anọ ahu di ndu: onwunwu di-kwa-ra ọku ahu, àmùmà nēsi kwa n'ọku ahu b͕uputa.
14 Ihe anọ ahu di ndu nāb͕a ọsọ nālaghachi kwa dika ob͕ub͕u-àmùmà si di n'ile ya anya.
15 M'we hu ihe anọ ahu di ndu, ma, le, otù wheel di n'ala n'akuku ihe ọ bula n'ihe anọ ahu di ndu, diri iru anọ ya n'otù n'otù.
16 Ka wheel nile ahu na otú emere ha si di n'ile ha anya, ha di ka ib͕u-maramara nkume beryl: ọ bu kwa otù oyiyi ka ha anọ nwere: ka ha na otú emere ha si di n'ile ha anya, ha di ka agāsi na ọ bu wheel n'etiti wheel.
17 Ọ bu n'akuku anọ ha ka ha nāga mb͕e ha nāga: ha adighi-agha anya n'azu mb͕e ha nāga.
18 Ma azu wheel nile ha, ha di elu, ha di kwa egwu; azu wheel nile ha juputara n'anya anya buruburu ha anọ.
19 Ma mb͕e ihe anọ ahu di ndu nāga, wheel-ha nāga n'akuku ha: ọzọ, mb͕e anēsi n'elu uwa buli ihe anọ ahu di ndu, anēbuli wheel-ha.