18 Ebube Jehova we si n'elu nbata-uzọ nke ulo ahu pua, guzo n'elu cherubim.
19 Cherubim we chilie nkù-ha, si n'ala bulie onwe-ha elu n'anyam mb͕e ha puru, wheel nile ha di kwa n'akuku ha: ha we guzo n'oghere nke ọnu-uzọ-ama Iru-anyanwu nke ulo Jehova; ebube nke Chineke nke Israel di n'elu ha n'elu.
20 Nka bu ihe ahu di ndu nke m'huru n'okpuru Chineke nke Israel n'akuku osimiri Keba; m'we mara na cherubim ka ha bu.
21 Iru anọ iru anọ diri cherub ọ bula, nkù anọ di-kwa-ra cherub ọ bula; oyiyi nke aka madu di kwa n'okpuru nkù-ha.
22 Ma oyiyi nke iru-ha, ha onwe-ha bu iru nke m'huru n'akuku osimiri Keba, ka ha si di n'ile ha anya na ha onwe-ha; ha nāga n'iru, onye ọ bula na ncherita-iru ya.