9 Ma onye-amuma ahu, mb͕e agārafu ya, o we kwue okwu, Mu onwem, bú Jehova, arafuwo onye-amuma ahu, M'gēsetipu kwa akam n'aru ya, kpochapu ya n'etiti ndim, bú Israel.
10 Ha gēbu kwa ajọ omume-ha: dika ajọ omume nke onye nāju ase, otú a ka ajọ omume nke onye-amuma gādi;
11 ka ulo Israel we ghara ikpafu kwa ọzọ n'isom, ghara kwa iwere njehie nile ha merua onwe-ha ọzọ; ha ewe ghọrọm otù ndi, Mu onwem gābu-kwa-ra ha Chineke; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.
12 Okwu Jehova we ruem nti, si,
13 Nwa nke madu, mb͕e ala ọ bula nēmehie megidem n'imekpu ihe-nmekpu, M'we setipu akam imegide ya, b͕ajiere ya nkpa-n'aka, bú achicha, zite oké unwu nime ya, bipu madu na anumanu nime ya;
14 asi na ndikom atọ ndia, bú Noa na Daniel na Job, nọ n'etiti ya, ha onwe-ha gēji ezi omume-ha naputa nání nkpuru-obi-ha; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.
15 Asi na emem ka ajọ anu-ọhia gabiga n'ala ahu, ha we b͕aba ya aka, o we ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu, ghara inwe onye ọ bula nāgabiga ya n'ihi anu-ọhia ahu;