2 Nwa nke madu, tua otù ilu, tu-kwa-ra ulo Israel otù ilu;
3 si, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Ugo uku nke nkù-ya abua di uku, ábúbà-ya di kwa ogologo, nke juputara n'uruma, nke turu agwa, biaruru Lebanon, were ọnu-ọnu cedar:
4 ọnu nke alaka-ya nile wara ọhu ka ọ kubipuru, būru ba n'ala izu-ahia; n'obodo ndi-ahia ka o doro ya.
5 O we chiri ufọdu na nkpuru ala ahu, kua ya n'ubi di nma iku nkpuru; ọ kuru ya n'akuku ọtutu miri; dika osisi willow ka o tiyere ya.
6 O we pue, ghọ osisi vine nāwasa awasa nke di nkpunkpu, nke alaka-ya nile chere ya iru, nkpọrọgwu-ya nile di kwa n'okpuru ya: o we ghọ osisi vine, waputa ngalaba, wa alaka mara nma.
7 Ugo uku ọzọ di kwa, nke nkù-ya abua di uku, uruma-ya di kwa ọtutu: ma, le, osisi vine a rubere nkpọrọgwu-ya nile n'ebe ọ nọ, ọ bu kwa alaka-ya nile ka ọ wara n'ebe ọ nọ site na nkpuru nile nke ebe akuru ya, ka o we b͕a ya miri.
8 N'ubi ọma n'akuku ọtutu miri ka akuru ya, ka o we waputa ngalaba, mia nkpuru, ghọ osisi vine mara nma.