8 Ndi bi na Zaidon na Avad abuworo gi ndi-umara: ndi-gi ndi mara ihe, gi Taia, anọwo nime gi, ha onwe-ha bu ndi-ọ̀kà-ub͕ọ-gi.
9 Ndi-okenye Gebal na ndi-ya ndi mara ihe anọwo nime gi buru ndi nākwuchi oghere-ub͕ọ-gi: ub͕ọ nile nke oké osimiri na ndi-ub͕ọ-ha anọwo nime gi izu ahia gi.
10 Peasia na Lud na Put anọwo n'usu-ndi-agha-gi, ha bu ndi-agha-gi: ọta na okpu-agha ka ha kobere nime gi; ndi ahu gosiri ima-nma-gi.
11 Umu Avad na usu-ndi-agha-gi nọ n'elu mb͕idi-gi nile buruburu, Gamadim anọwo kwa n'ulo-elu-gi nile: ọta-ha ka ha kokwasiri na mb͕idi-gi nile buruburu; ndi ahu emewo ka ima-nma-gi zue oké.
12 Tashish bu onye-ahia-gi site n'iba-uba nke àkù nile ọ bula; ọla-ọcha na ígwè na b͕amb͕am na opù ka ha jiri zu ihe-izu-ahia-gi nile.
13 Jevan, na Tubal, na Meshek, ndi ahu bu ndi-ahia-gi: madu onwe-ha na ihe di iche iche nke ọla ka ha jiri zu ihe-izu-ahia-gi.
14 Ndi ulo Togama chiri inyinya na ndi-inyinya na inyinya mule zua ihe-ahia-gi nile.