13 N'ihi na otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: N'ọgwugwu ọgu arọ abua ka M'gāchikọputa ndi Ijipt nime ndi nile di iche iche ebe achusara ha:
14 M'gēme kwa ka ndi Ijipt adọtara n'agha laghachi, M'gēme kwa ka ha laghachi n'ala Patros, n'ala nputa-n'uwa-ha; ha ewe nọ n'ebe ahu, buru ala-eze di ala.
15 Ọ gādi ala kari ala-eze nile; ọ gaghi-ebuli kwa onwe-ya ọzọ n'elu mba nile: M'gēme kwa ka ha di ole-na-ole, ka ha ghara inwe ike n'aru mba nile.
16 Ọ gaghi-abu-kwa-ra ulo Israel ihe-ntukwasi-obi nēme ka echeta ajọ omume, mb͕e ha nēche iru ile ha anya n'azu: ha ewe mara na Mu onwem bu Onye-nwe-ha Jehova.
17 O rue, n'arọ nke-oru-na-asa, n'ọnwa mbu, n'ubọchi mbu nke ọnwa ahu, na okwu Jehova rurum nti, si,
18 Nwa nke madu, Nebukadreza, bú eze Babilon, mere ka usu-ndi-agha-ya fè òfùfè uku megide Taia: isi nile ọ bula ka emere isi-nkwọcha, ubu nile ọ bula ka echihiara echihia: ma ọ dighi ugwọ-ọlu ọ natara, ọ dighi kwa nke usu-ndi-agha-ya natara, n'aka Taia, n'ihi òfùfè ahu o fère megide ya.
19 N'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: Le, M'gaje inye Nebukadreza, bú eze Babilon, ala Ijipt; ọ gāchilaga kwa ìgwè ndi-ya, kwata ihe-nkwata-ya, luta ihe-nluta-ya n'agha; o we buru ugwọ-ọlu agākwu usu-ndi-agha-ya.