13 Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: M'gēme kwa ka arusi nile la n'iyì, M'gēme kwa ihe-efu nile kwusi na Nof; ọ dighi kwa onye-isi gēsi n'ala Ijipt puta ọzọ: M'gētiye kwa egwu n'ala Ijipt.
14 M'gēme kwa ka Patros tọb͕ọrọ n'efu, M'gētiye kwa ọku nime Zoan, me kwa ihe nile ekpere ikpe nime No.
15 M'gāwukwasi kwa ọnumam nime Sin, bú ebe siri ike nke Ijipt; M'gēbipu igwè ndi No.
16 M'gētiye kwa ọku n'Ijipt; Sin gāb͕ali nke-uku, No ka agētipu: Nof gēnwe kwa ndi-nkpab͕u ogologo ubọchi nile.
17 Umu-okorọbia nke Even na Pi-beset gāda site na mma-agha: obodo ndia gāla na ndọta-n'agha.
18 Ọ bu kwa na Tehafnehes ka ubọchi gāb͕a ọchichiri, mb͕e M'gāb͕aji yoke nile nke Ijipt n'ebe ahu, npako nke ike-ya gākwusi kwa nime ya: ya onwe-ya, igwe-oji gēkpuchi ya, umu-ya ndinyom gāla kwa na ndọta-n'agha.
19 M'gēme kwa ihe nile ekpere n'ikpe n'Ijipt: ha ewe mara na Mu onwem bu Jehova.