7 Ha gātọb͕ọrọ kwa n'efu n'etiti ala nile nke tọb͕ọrọ n'efu, obodo-ya nile gādi kwa n'etiti obodo nile nke bu nkpọnkpọ.
8 Ha gāma kwa na Mu onwem bu Jehova, mb͕e M'tiyesiri ọku n'Ijipt, na mb͕e etijisiri ndi nile nēyere ya aka.
9 N'ubọchi ahu ndi-ozi gēsi n'irum pua je n'ub͕ọ di iche iche ime ka Etiopia ma jijiji, bú ndi nọ na ntukwasi-obi; ihe-nb͕ali gādi kwa n'aru ha, dika n'ubọchi Ijipt, n'ihi na, le, ọ nābia.
10 Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: M'gēme kwa ka ìgwè ndi Ijipt kwusi, n'aka Nebukadreza, bú eze Babilon.
11 Ya onwe-ya na ndi-ya so ya, bú ndi kachasi mba nile n'ime ka madu ma jijiji, agaje ime ka ha bata ibibi ala ahu; ha gāmiputa kwa mma-agha-ha imegide Ijipt, ha gēmeju kwa ala ahu na ndi eb͕uru eb͕u.
12 M'gēme kwa ka osimiri Nail nile ghọ ebe kpọrọ nku, M'gēre kwa ala ahu n'aka ndi ọjọ, me ka ala ahu na ùjú-ya tọb͕ọrọ n'efu, site n'aka ndi ala ọzọ: Mu onwem, bú Jehova, ekwuwo okwu.
13 Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: M'gēme kwa ka arusi nile la n'iyì, M'gēme kwa ihe-efu nile kwusi na Nof; ọ dighi kwa onye-isi gēsi n'ala Ijipt puta ọzọ: M'gētiye kwa egwu n'ala Ijipt.