19 Ònye ka i tọkariri n'utọ? rida, ka eme kwa ka i soro ndi anēbighi úgwù dina.
20 N'etiti ndi ejiri mma-agha b͕u ka ha gāda: ewerewo ya nye mma-agha: kpupunu ya na ìgwè ndi-ya nile.
21 Ndi di ike nke ndi-dike gēsi n'etiti ala-mọ gwa ya okwu, ha na ndi nēyere ya aka: ha aridawo, ha edinawo ala, bú ndi anēbighi úgwù, ndi ejiri mma-agha b͕u.
22 N'ebe ahu ka Asiria na nkpọkọta ndi ya nile di; n'ebe nile di ya buruburu ka ílì-ya nile di: ha nile bu ndi eb͕uru eb͕u, ndi daworo site na mma-agha:
23 ndi etiyere ílì nile ha na nsọtu nile nke olùlù, nkpọkọta ndi-ya di ílì-ya buruburu: ha nile bu ndi eb͕uru eb͕u, ndi daworo site na mma-agha, bú ndi mere ka ujọ di n'ala ndi di ndu.
24 N'ebe ahu ka Ilam na ìgwè ndi-ya nile ndi nọ ílì-ya buruburu di: ha nile bu ndi eb͕uru eb͕u, ndi daworo site na mma-agha, ndi ridara n'ebighi-úgwù rue ala di n'okpuru uwa, bú ndi mere ka ujọ-ha di n'ala ndi di ndu, we būru ihere-ha, ha na ndi nārida n'olùlù.
25 N'etiti ndi eb͕uru eb͕u ka ha nyeworo ya ihe-ndina n'etiti ìgwè ndi-ya nile; n'ebe nile di ya buruburu ka ílì-ya nile di: ha nile bu ndi anēbighi úgwù, ndi ejiri mma-agha b͕u; n'ihi na emere ka ujọ-ha di n'ala ndi di ndu, ha we būru ihere-ha, ha na ndi nārida n'olùlù: n'etiti ndi eb͕uru eb͕u ka etiyeworo ya.