21 N'ihi na unu ji akuku na ubu-aka enuzuga, na n'ihi na unu ji mpi-unu asọzuga anu nile nāria ọria, rue mb͕e unu chusasiri ha n'èzi;
22 n'ihi nka M'gāzọputa ìgwè ewu na aturu nkem, ha agaghi-aghọ kwa ihe-nluta-n'agha ọzọ; M'gēkpe kwa ikpe n'etiti anu na anu.
23 M'gēme kwa ka otù onye-ọzùzù-aturu biliere ha, ọ gāzù kwa ha, ọbuná orùm, bú Devid; ya onwe-ya gāzù ha, ya onwe-ya gābu-kwa-ra ha onye-ọzùzù-aturu.
24 Mu onwem, bú Jehova, gābu-kwa-ra ha Chineke, orùm, bú Devid, gābu kwa onye-isi n'etiti ha; Mu onwem, bú Jehova, ekwuwo okwu.
25 Mu na ha gāb͕a kwa ọb͕ub͕a-ndu udo, M'gēme kwa ka ajọ anu-ọhia kwusi n'ala-ha: ha gēbi n'ọzara na ntukwasi-obi, raru ura n'oké ọhia.
26 M'gēme kwa ka ha na ebe nile nke di ugwu ntàm buruburu ghọ ngọzi; M'gēme kwa ka oké miri-ozuzo zo na mb͕e-ya; oké miri-ozuzo nke ngọzi gādi.
27 Osisi ọhia gāmi kwa nkpuru-ya, ala gēme kwa ihe-ọmume-ya, ha gānọ kwa n'elu ala-ha na ntukwasi-obi; ha gāma kwa na Mu onwem bu Jehova, mb͕e M'tijiworo nkpọrọ nile nke yoke-ha, naputa ha n'aka ndi mere ha ka ha fè ha òfùfè.