10 Ime-ulo nke ọnu-uzọ-ama n'uzọ Iru-anyanwu di atọ n'otù akuku, atọ n'akuku nke-ọzọ; otù ọtùtù ka ha atọ nwere: ọ bu kwa otù ọtùtù ka akuku-ọnu-uzọ abua nwere n'otù akuku na n'akuku nke-ọzọ.
11 O we tùa obosara nke oghere ọnu-uzọ-ama, cubit iri; na ogologo nke ọnu-uzọ-ama, cubit iri-na-atọ;
12 na ókè-ala n'iru ime-ulo nile, otù cubit n'otù akuku, na ókè-ala, otù cubit n'akuku nke-ọzọ; na ime-ulo onwe-ya, cubit isi n'otù akuku na cubit isi n'akuku nke-ọzọ.
13 O we tùa ọnu-uzọ-ama site n'elu-ulo nke otù ime-ulo rue elu-ulo nke ime-ulo-ibe-ya, obosara-ya di orù cubit na ise; oghere na ncherita-iru oghere.
14 O we me akuku-ọnu-uzọ, ọgu cubit atọ; ọbuná rue akuku-ọnu-uzọ nke ogige, ọnu-uzọ-ama di buruburu n'akuku nile.
15 Ọzọ, site n'iru ọnu-uzọ-ama, na nbata, rue iru uzọ-nbata nke ọnu-uzọ-ama di nime di ọgu cubit abua na iri.
16 Ọzọ, window emechiri emechi diri ime-ulo nile, di-kwa-ra akuku-ọnu-uzọ nile ha n'ime ọnu-uzọ-ama buruburu n'akuku nile, otú a ka window di-kwa-ra ulo-nbata nile: window di kwa n'ime ulo buruburu n'akuku nile: nkwu di kwa n'akuku-ọnu-uzọ ọ bula.