6 N'ihi na okpukpu atọ ka ha di, ha enweghi kwa ogidi dika ogidi nke ogige abua ahu: n'ihi nka emere ka ime-ulo nke kachasi elu di nkpa kari nke di ala na nke etiti site n'ala.
7 Ma mb͕idi nke di n'èzí n'akuku ime-ulo nile, n'uzọ ogige di n'èzí n'iru ime-ulo ahu, ogologo-ya di ọgu cubit abua na iri.
8 N'ihi na ogologo nke ime-ulo nke diri ogige di n'èzí di ọgu cubit abua na iri: ma, le, n'iru ulo uku Chineke ọ di ọgu cubit ise.
9 Site kwa n'okpuru ime-ulo ndia ka nbata di n'akuku Iru-anyanwu, ebe anēsi n'ogige di n'èzí abata nime ha.
10 N'ib͕idi nke mb͕idi ogige n'uzọ Iru-anyanwu, n'iru ebe ahu ekewapuru ekewapu, na n'iru ulo ahu anēwu ewu, ka ime-ulo di iche iche di.
11 Uzọ nke di n'iru ha di kwa ka uzọ nke ime-ulo nke di n'uzọ Ugwu si di n'ile ha anya; dika ogologo-ha si di, otú a ka obosara-ha di: ọpùpù nile ha di ka ikpé nile ha si di, na dika ọnu-uzọ nile ha si di.
12 Ma dika ọnu-uzọ nile nke ime-ulo nile si di nke di n'uzọ Ndida, otú a ka otù ọnu-uzọ si di nke di n'isi uzọ, bú uzọ nke di n'iru mb͕idi n'uzọ Iru-anyanwu, ebe anābà nime ha.