Ezikiel 46:12-18 IGBOB

12 Ma mb͕e onye-isi gēdozi àjà-afọ-ofufo, ma ọ bu àjà-nsure-ọku ma-ọbu àjà-udo, iburu Jehova onyinye-afọ-ofufo, agēmeghere ya ọnu-uzọ-ama ahu nke nēche iru n'Iru-anyanwu, ọ gēdozi kwa àjà-nsure-ọku-ya na àjà-udo-ya nile, dika o si eme n'ubọchi-izu-ike: ọ gāpu kwa, ewe mechie ọnu-uzọ-ama mb͕e ọ pusiri.

13 Ọzọ, otù nwa-aturu nke b͕ara otù arọ nke zuru okè ka i gēdozi ibu àjà-nsure-ọku anēsurere Jehova kwa-ubọchi: kwa-ututu kwa-ututu ka i gēdozi ya.

14 I gēdozi-kwa-ra ya onyinye-inata-iru-ọma kwa-ututu kwa-ututu, otù uzọ n'uzọ isi nke otù ephah, na manu, otù uzọ n'uzọ atọ nke otù hin, iji gwọ utu ọka flour; ọ bu onyinye-inata-iru-ọma anēnye Jehova mb͕e nile n'ukpuru ebighi-ebi.

15 Otú a ka ha gēdozi nwa-aturu ahu, na onyinye-inata-iru-ọma ahu, na manu ahu, kwa-ututu kwa-ututu, ibu àjà-nsure-ọku mb͕e nile.

16 Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Mb͕e onye-isi gēnye onye ọ bula n'umu-ya ndikom onyinye, ihe-nketa-ya ka ọ bu, umu-ya ndikom gēnwe ya; ihe-onwunwe-ha ka ọ bu n'ihe-nketa.

17 Ma mb͕e ọ gēnye otù onye nime ndi-orù-ya onyinye nke sitere n'ihe-nketa-ya, ọ gābu kwa nke ya rue arọ izilaga orù ka o nwere onwe-ya; onyinye ahu we laghachikute onye-isi; nání na ihe-nketa-ya, bú ihe-nketa umu-ya ndikom, nke ha ka ọ gābu.

18 Ọzọ, onye-isi agaghi-ewere ihe ọ bula n'ihe-nketa nke ndim, inapu ha ihe-nketa-ha n'ike; ihe nke si n'ihe-onwunwe-ya puta ka ọ gēme ka umu-ya ndikom keta: ka ndim we ghara ib͕asa, onye ọ bula ọ pua n'ihe-onwunwe-ya.