13 N'ihi na onye nēre ere agaghi-alaghachikute ihe erere, ọ bu ezie na ndu-ha nādi kwa n'etiti ndi di ndu: n'ihi na ọhù ahu diri ìgwè madu-ya nile, ọ gaghi-alaghachi; ọ dighi kwa onye ọ bula gēji ajọ omume nke ndu-ya me onwe-ya ka ọ di ike.
14 Ha afùwo opì-ha, dozie ihe nile; ma ọ dighi onye nēje agha: n'ihi na iwem nke di ọku nēmegide ìgwè madu-ya nile.
15 Mma-agha di n'èzí, ajọ ọria nke nēfe efe na oké unwu di kwa n'ulo: onye nọ n'ọhia gānwu na mma-agha; ọzọ, onye nọ n'obodo, oké unwu na ajọ ọria nēfe efe gērichapu ya.
16 Ma ndi-ha b͕apuru ab͕apu gāb͕apu, nọ n'ugwu nile dika nduru nke ndagwurugwu, ha nile nēkwo ákwá, onye ọ bula n'ajọ omume-ya.
17 Aka nile gākuda, ikperè nile gābu nání miri miri.
18 Ha gēke kwa ákwà-nkpe n'úkwù-ha, oké ọma-jijiji gēkpuchi kwa ha; ọ bu kwa iru nile ka ihere gēme, n'isi nile ha ka nkwọcha-isi gādi kwa.
19 Ọla-ọcha-ha ka ha gātufu n'èzí nile, ọla-edo-ha gāghọ kwa ihe-isọ-nsọ; ọla-ọcha-ha na ọla-edo-ha agaghi-enwe ike inaputa ha n'ubọchi nrubiga-ókè nke iwe Jehova; ha agaghi-eme ka afọ ju nkpuru-obi-ha, ha agaghi-emeju kwa ngiri-afọ-ha: n'ihi na ihe-isu-ngọngọ nke ajọ omume-ha ka ọ buworo.