36 Ma otú ọ di, isi-iyi ma-ọbu olùlù-miri, bú nchikọta miri, gādi ọcha: ma onye nēmetu ozu-ha aka gāru árú.
37 Ma mb͕e ihe nke si n'ozu-ha gādakwasi nkpuru-ọghigha ọ bula nke anāgha agha, ihe di ọcha ka ọ bu.
38 Ma mb͕e agētiye miri n'elu nkpuru-ọghigha, ma ihe si n'ozu-ha adakwasi ya, ihe ruru árú ka ọ buru unu.
39 Ọzọ, mb͕e otù nime anumanu, nke buru unu ihe-oriri, gānwu; onye nēmetu ozu-ya aka gāru árú rue anyasi.
40 Onye nēri ufọdu nime ozu-ya gāsu uwe-ya, ru kwa árú rue anyasi: onye ahu nke nēbu ozu-ya gāsu kwa uwe-ya, ru kwa árú rue anyasi.
41 Ọzọ ihe ọ bula nke nēnuputa enuputa nke nēnuputa n'elu uwa, ihe-árú ka ọ bu; agaghi-eri ya.
42 Ihe ọ bula nke nēje ije n'afọ-ya, na ihe ọ bula nke nēje ije n'ukwu anọ, ma-ọbu ihe ọ bula nwere ọtutu ukwu, ọbuná ihe nile nēnuputa enuputa nke nēnuputa n'elu uwa, unu erila ha; n'ihi na ihe ruru árú ka ha bu.