11 ekpenta site na mb͕e ochie ka ọ bu n'akpukpọ anu-aru-ya, onye-nchu-àjà gāsi kwa na ọ ruru árú: ọ gaghi-emechibido ya nime ulo; n'ihi na onye ruru árú ka ọ bu.
12 Ọ buru kwa na ekpenta ab͕awaputa nke-uku n'akpukpọ-aru-ya, ekpenta ahu ewe kpuchie akpukpọ-aru nile nke onye nwere ihe-otiti ahu site n'isi-ya we rue ukwu-ala-ya, ọbuná ihe nile anya onye-nchu-àjà nāhu;
13 onye-nchu-àjà gāhu kwa ya: ma, le, ọ buru na ekpenta ekpuchiwo anu-aru-ya nile, ọ gāsi kwa na onye nwere ihe-otiti ahu di ọcha: aru-ya nile ab͕anwewo ọcha: ọcha ka ọ di.
14 Ma n'ubọchi anāhu anu-aru ndu nime ya, ọ gāru árú.
15 Onye-nchu-àjà gāhu kwa anu-aru ndu ahu, si na ọ ruru árú: anu-aru ndu ahu, ihe ruru árú ka ọ bu: ekpenta ka ọ bu.
16 Ma-ọbu mb͕e anu-aru ndu ahu gātughari, b͕anwe ọcha, ọ gābiakute kwa onye-nchu-àjà,
17 onye-nchu-àjà gāhu ya: ma, le ọ buru na ihe-otiti ahu ab͕anwewo ọcha, onye-nchu-àjà gāsi na onye nwere ihe-otiti ahu di ọcha: ọcha ka ọ di.