Levitikọs 13:52-58 IGBOB

52 O gēsure kwa uwe ahu ọku, ma ọ bu nke akpara ogologo, ma-ọbu nke akpara uhie, n'aji-anu ma-ọbu na flax, ma-ọbu ihe akpukpọ ọ bula, nke ihe-otiti ahu di nime ya: n'ihi na ekpenta jọb͕uru onwe-ya ka ọ bu; n'ọku ka agēsure ya.

53 Ma ọ buru na onye-nchu-àjà ahú, ma, le, ihe-otiti ahu abaghi aba n'uwe ahu, ma ọ bu na nke akpara ogologo, ma ọbu na nke akpara uhie, ma-ọbu n'ihe akpukpọ ọ bula;

54 onye-nchu-àjà gēnye kwa iwu ka ha sua ihe ahu nke ihe-otiti ahu di nime ya, o gēmechibido kwa ya nime ulo ubọchi asa ọzọ:

55 onye-nchu-àjà gāhu kwa, mb͕e asuchasiri ihe-otiti ahu: ma, le, ọ buru na ihe-otiti ahu ab͕anweghi iru-ya, ọ buru kwa na ihe-otiti ahu abaghi aba, ihe ruru árú ka ọ bu; n'ọku ka i gēsure ya: ekpenta ka ọ bu, ma ọ bu n'isi-nkwọcha-ya ma-ọbu n'egedege-iru-ya kwọchara akwọcha.

56 Ma ọ buru na onye-nchu-àjà ahú, ma, le, ihe-otiti ahu bu ihe anāhu inyoghi-inyoghi mb͕e asuchasiri ya, ọ gādọwapu kwa ya nime uwe ahu, ma-ọbu nime akpukpọ ahu, ma-ọbu nime nke akpara ogologo, ma-ọbu nime nke akpara uhie.

57 Ma ọ buru na anāhu ya n'uwe ub͕u a, ma ọ bu na nke akpara ogologo, ma-ọbu na nke akpara uhie, ma-ọbu na nke ihe akpukpọ ọ bula, ihe nāb͕awaputa ka ọ bu: n'ọku ka i gēsure ihe ahu nke ihe-otiti ahu di nime ya.

58 Uwe ahu kwa, ma ọ bu nke akpara ogologo, ma-ọbu nke akpara uhie, ma-ọbu ihe akpukpọ ọ bula, nke i gāsu, ọ buru na ihe-otiti ahu esiwo nime ha wezuga onwe-ya, agāsu kwa ya nke ub͕ò abua, ọ gādi kwa ọcha.